Numbers 1

Ịgụ ọnụ

1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼọzara Saịnaị, nʼime ụlọ nzute, nʼụbọchị nke mbụ,
Nke a bụ otu ọnwa site nʼoge ụmụ Izrel si Ijipt rute nʼọzara Saịnaị, Ọpụ 9:1 otu ọnwa mgbe arụchara ụlọ nzute ahụ nʼọzara, Ọpụ 40:17 bụrụkwa mgbe abalị iri na ise gafesịrị site nʼoge ha mere ncheta Mmemme Ngabiga nʼọzara Saịnaị.
nʼọnwa nke abụọ nke afọ abụọ, mgbe ụmụ Izrel pụtachara site nʼobodo Ijipt. Ọ sịrị,
2“Gaa gụọ ma chọpụta ọnụọgụgụ ndị ikom niile e nwere nʼetiti ọgbakọ Izrel, dịka ebo ha na agbụrụ ha si dị, na dịka ezinaụlọ ha si dịkwa. Depụta aha nwoke ọbụla nʼotu na otu. 3Gị na Erọn ga-agụkọta ndị ikom Izrel niile gbara iri afọ abụọ maọbụ karịa ọnụ, bụ ndị tozuru ije agha. Unu ga-edo ha nʼusuu, nʼusuu. 4Otu nwoke, site nʼebo Izrel ọbụla, onye bụ onyendu ezinaụlọ, ga-esonyere unu nʼọrụ a.

5“Ndị a bụ aha ndị ikom ndị ahụ ga-enyere unu aka.

“Site nʼebo Ruben, Elizọ na Shedeua,
6site nʼebo Simiọn, Shelumiel nwa Zurishadai,
7site nʼebo Juda, Nashọn nwa Aminadab,
8site nʼebo Isaka, Netanel nwa Zua,
9site nʼebo Zebụlọn, Eliab nwa Helọn,
10Site nʼụmụ Josef:
site nʼebo Ifrem, Elishama nwa Amihud
site nʼebo Manase, Gamaliel nwa Pedazo
11site nʼebo Benjamin, Abidan nwa Gidiọn
12site nʼebo Dan, Ahieza nwa Amishadai
13site nʼebo Asha, Pagịel nwa Okran
14site nʼebo Gad, Eliasaf nwa Deuel
15site nʼebo Naftalị, Ahira nwa Enan.”

16Ndị a bụ ndị ikom e si nʼọgbakọ ahụ họpụta, ndị bụ ndị ndu ebo dị iche iche nʼIzrel. Ha bụ ndị ndu ebo niile dị nʼIzrel.

17Mosis na Erọn nabatara ndị ikom ndị a, bụ ndị e depụtara aha ha. 18Emesịa, ha kpọrọ nzukọ ndị Izrel niile ka ha zukọọ nʼụbọchị mbụ nke ọnwa abụọ. Ndị niile zukọrọ kọwara ikwu ha na ezinaụlọ ha si pụta nʼotu na otu. Ma ndị ikom niile gbara site nʼiri afọ abụọ gbagoo ka e denyere aha ha nʼakwụkwọ nʼotu na otu, 19dịka Onyenwe anyị si nye Mosis nʼiwu. Otu a kwa ka Mosis si gụọ ha ọnụ nʼọzara Saịnaị.

20Ụmụ Ruben, bụ ọkpara Izrel: Ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo; ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 21Ọnụọgụgụ ndị niile si nʼebo Ruben dị iri puku anọ, puku isii na narị ise (46,500).

22Site nʼụmụ Simiọn, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 23Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Simiọn dị iri puku ise, puku itoolu na narị atọ (59,300).

24Site nʼụmụ Gad, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 25Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Gad dị iri puku anọ, puku ise na narị isii na iri ise (45,650).

26Site nʼụmụ Juda, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 27Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Juda dị iri puku asaa, puku anọ na narị isii (74,600).

28Site nʼụmụ Isaka, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 29Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Isaka dị iri puku ise, puku anọ na narị anọ (54,400).

30Site nʼụmụ Zebụlọn, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 31Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Zebụlọn dị iri puku ise, puku asaa na narị anọ (57,400).

32Site nʼụmụ Josef, ya bụ ụmụ Ifrem, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 33Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Ifrem dị iri puku anọ na narị ise (40,500).
34Site nʼụmụ Manase, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 35Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Manase dị iri puku atọ, puku abụọ na narị abụọ (32,200).

36Site nʼụmụ Benjamin, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 37Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Benjamin dị iri puku atọ, puku ise na narị anọ (35,400).

38Site nʼụmụ Dan, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 39Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Dan dị iri puku isii, puku abụọ na narị asaa (62,700).

40Site nʼụmụ Asha, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 41Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Asha dị iri puku anọ, otu puku na narị ise (41,500).

42Site nʼụmụ Naftalị, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dị ka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 43Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Naftalị dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ (53,400).

44Ndị a bụ ndị ikom Mosis na Erọn, na ndị ndu Izrel iri na abụọ ndị ahụ gụrụ ọnụ, onye ọbụla nʼime ha nọchitere anya ezinaụlọ ya. 45Ndị Izrel niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị nwere ike ije agha ka a gụrụ ọnụ dịka ezinaụlọ ha si dị. 46Mgbakọ ọnụọgụgụ ndị a niile dị, narị puku isii, puku atọ, narị ise na iri ise (603,550).

47A gụnyekọtaghị ọnụọgụgụ ebo nna nna Livayị nʼịgụ ọnụ a, 48nʼihi na Onyenwe anyị gwara Mosis, sị, 49“Ị gaghị agụ ndị ebo Livayị ọnụ. Ị gakwaghị agbakọnye ọnụọgụgụ ha nʼọnụọgụgụ ndị Izrel. 50Kama, ị ga-ahọpụta ndị Livayị ka ha bụrụ ndị nlekọta ụlọ nzute Ihe Ama, na ngwongwo niile, na ihe niile dị nye ya. Ọ bụ ha ga-ebu ụlọ nzute ahụ na ngwongwo ya niile: ha ga na-elekọta ihe banyere ya, ọ bụkwa gburugburu ya ka ha ga-ama ụlọ ikwu ha. 51Mgbe ọbụla kwa a ga-ebugharị ya maka njem, ọ bụ ọrụ ha iweda ya. Mgbe ọbụla a ga-eguzo ya ọtọ, ọ bụkwa ọrụ ndị Livayị iguzobe ya ọtọ. Onye ọbụla ọzọ ga-abịa nso ka a ga-egbu. 52Ebo Izrel ndị ọzọ ga-enwe ebe dị iche nye onwe ha, ebe ha ga-ewu ụlọ ikwu ha. Ha ga-akwụbakwa ọkọlọtọ nke ha, igosi aha ebo ha. 53Ndị Livayị ga-ama ụlọ ikwu ha gburugburu ụlọ nzute Ihe Ama ahụ, ka iwe ọkụ m ghara ịbịakwasị nʼahụ nzukọ ụmụ Izrel. Ọ bụ ọrụ ndị Livayị ilekọta ụlọ nzute Ihe Ama ahụ.”

54Ya mere, Izrel mere ihe ndị a niile Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.

Copyright information for IboBIU